Uru Nzu Bara N'ala Igbo

Nzu2

Nzu bụ ihe dị oke mkpa n’ala Igbo. Nzu dị nta ma o nwere ugwu dị ukwuu. Ọ bụrụ na ọjị osisi adịghị n’ụlọ ma nzu dị, onye nwe ụlọ agaghị asị na ya enweghị ọjị. Nke a na-egosi na nzu bụ ọjị.

N’ezie, n’ụlọ onye chiri echichi, ọjị osisi nwere ike ghara ịdị ma ọ gaghị ekwe ka nzu kọọ n’obi ya. Na mgbe ochie, mgbe ụzọ jupụtara n’ihe egwu, nzu bara uru n’ụzọ pụrụ iche.

Ọ bụrụ na onye mba abịa be enyi ya, ọ ga-egbu nzu n’iku anya na mbọ ụkwụ. Ajọ mmadụ hụrụ ya n’ụzọ mgbe ọ na-ala agaghị ele ya ajọ anya n’ihi na uche ya ga-agwa ya na onye ọbịa ahụ bara na be onye a ma ama.

Ịba nzu n’anya ma ọ bụ n’ụkwụ na-egosi na onye ahụ nwere mmadụ ma ọ bụ na ọ ma mmadụ n’obodo ahụ. O nwekwara uru ọzọ nzu bara. Nzu bụ nnukwute ọgwụ e ji agwọ arụbara. A na-ete ụmụ a mụrụ ọhụrụ nzu iji mee ka akpụkpọ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ.

N’okwu arụsị, a na-edote nzu maka ịgọdo ala, ịchụ aja udo, igosi na ebe ahụ dị ọcha ma dịkwa nsọ. N’ihi ya, a gaghị agọ mmụọ ma ọ bụrụ na nzu adịghị. Onye na-echi ọzọ na-ete nzu n’ahụ ya niile.

Ndị egwu ụfọdụ na-ete nzu iji chọọ mma. Mgbe gboo, e ji nzu achọ ụlọ mma. Onye gaje n’okwu arụsị ga-edo onwe ya nsọ site n’ite nzu n’ahụ ya. N’ala Igbo, nzu bụ ihe a maara kacha ihe niile a na-ahụ anya ọcha.

Ya mere, mgbe a na-ama atụ ọdịdị ọcha ihe dị, a na-asị na ihe ahụ na-acha ka nzu. A na-atakwa nzu ata.

Gbasaa

  • X
  • Facebook
  • WhatsApp

Like this:

Like Loading...

Edemede Ndị Ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Type your email…

Subscribe

Từ khóa » Gini Bụ ọjị Na Ala Igbo